Proverbs 16

1Mmadụ nwere ike pịa ihe ọ chọrọ ime,
ma okwu ikpeazụ ga-esi nʼọnụ Onyenwe anyị.

2Ụzọ niile nke mmadụ dị ọcha nʼanya ya,
ma Onyenwe anyị na-atule ebumnobi niile nke mmadụ.

3Were ọrụ gị niile nyefee nʼaka Onyenwe anyị,
ọ ga-eme ka ha gaa nʼihu.

4 Onyenwe anyị na-eme ka ihe niile rụpụta ebumnuche ya,
o bụladị ndị mmebi iwu ka e debere maka ụbọchị mbibi.

5 Onyenwe anyị kpọrọ ndị nwere obi dị mpako asị.
Mara nke a nke ọma: Ha aghaghị ịta ahụhụ.

6Ọ bụ site nʼịhụnanya na eziokwu ka eji ekpuchi mmehie;
ọ bụkwa site nʼegwu Onyenwe anyị ka mmadụ ji agbanarị mmehie.

7Mgbe ụzọ mmadụ na-agbaso na-atọ Onyenwe anyị ụtọ,
ọ na-eme ka mmadụ ahụ na ndị iro ya dị nʼudo.

8Ọ dị mma inwe ihe nta nʼezi omume
karịa inwe ọtụtụ uru nʼụzọ ikpe na-ezighị ezi.

9Anyị nwere ike pịa ọpịpịa nʼobi anyị,
maọbụ Onyenwe anyị na-edu ije anyị.

10Egbugbere ọnụ eze na-ekwu okwu sitere na-ezi nghọta,
ọnụ ya adịghị ekpe ikpe na-ezighị ezi.

11Ihe ọtụtụ ziri ezi na ihe niile ha nʼotu dịrị Onyenwe anyị,
ihe niile e ji atụ ihe dị nʼime akpa bụ ya mere ha.

12Ndị eze kpọrọ ime ihe na-adịghị mma asị,
nʼihi na site nʼezi omume ka ocheeze ji eguzosi ike.

13Ndị eze na-enwe mmasị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu eziokwu,
ha na-agụ onye na-ekwu eziokwu dị ka ezi mmadụ.

14Iwe eze bụ onyeozi nke ọnwụ.
Onye maara ihe ga-eme ka ọ dajụọ.

15Mgbe ọchị dị nʼihu eze ọ na-ewetara onye hụrụ ya ndụ,
ihuọma ya dị ka igwe ojii na-eweta mmiri ozuzo.
Mmiri ozuzo nʼoge ọkọchị na-eme ka ahịhịa kpọnwụrụ akpọnwụ tutee, nke a na-eweta ọnụ, nʼihi olileanya ọ na-enye banyere ụba nke ihe a kụrụ nʼubi.


16Ọ ka mma inwe amamihe na mmụọ ịghọta ihe
karịa inwe ọlaọcha na ọlaedo.

17Ụzọ dị larịị nke onye ziri ezi bụ iwezuga onwe ya pụọ nʼihe ọjọọ,
ndị na-echebe ụzọ ha niile na-echebekwa ndụ ha.

18Nganga na-eweta ịla nʼiyi,
mpako na-ewetakwa ọdịda.

19Ọ ka mma ịbụ onye ogbenye nwere obi umeala karịa ịbụ onye nganga,
na onye so ndị nganga keta oke nʼihe ha kwatara nʼagha.

20Onye ọbụla na-aṅa ntị na ndụmọdụ ka ihe na-agara nke ọma,
onye a gọziri agọzi bụ onye ahụ nke na-atụkwasị Onyenwe anyị obi.

21A na-amata onye nwere uche site nʼụdị nghọta o nwere.
Okwu dị ụtọ na-eme ka mmadụ mụta ihe nke ọma.

22Inwe uche bụ isi iyi ndụ nye ndị niile nwere ya,
ma enweghị uche na-ewetara ndị nzuzu ntaramahụhụ.

23Obi onye maara ihe na-eme ka e tinye uche nʼokwu ọnụ ya,
egbugbere ọnụ ha na-emekwa ka mmụta gaa nʼihu.

24Okwu dị nro na-atọ ụtọ ka mmanụ aṅụ,
ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ, na-enyekwa ọkpụkpụ ahụ ike.

25Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ,
ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ.

26Agụụ ihe oriri nke onye ọrụ na-arụpụtara ya ọrụ;
agụụ na-akpali mmụọ ya ịga nʼihu.

27Ndị ọjọọ na-atụpụta echiche ọjọọ,
egbugbere ọnụ ha dị ka ọkụ nke na-ekpochapụ ahụ.

28Onye na-emebi iwu na-agbasa ise okwu;
ha na-akpali nsogbu, na-ekewa enyi na enyi.

29Ndị ọjọọ na-arafu ndị agbataobi ha,
na-edubakwa ha nʼụzọ ga-ewetara ha mbibi.

30Onye ji ikuanya ya ekwu okwu na-atụ atụmatụ ọjọọ,
onye na-atabi egbugbere ọnụ ya abụọ ekpebiela ime mmehie.

31Isi awọ bụ okpueze nke mara mma,
a na-enweta ya nʼụzọ ezi omume.

32Onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ karịrị onye a maara aha ya.
Onye nwere ogologo ntachiobi karịrị onye na-adọta obodo nʼagha.

33A na-efe nza, nʼihi ịchọpụta uche Onyenwe anyị,
maọbụ Chineke nʼonwe ya na-ekpebi ihe a ga-efeta na nza ahụ.
Copyright information for IboBIU